20. Jeremaia we si, Ha agaghi-enye gi n'aka-ha. Biko, ge nti olu Jehova, n'ihe nke mu onwem nāgwa gi: o we diri gi nma, nkpuru-obi-gi gādi kwa ndu.
21. Ma ọ buru na gi onwe-gi aju na i gaghi-apu, nka bu okwu nke Jehova meworo ka m'hu:
22. Le, ndinyom ahu nile ndi fọduru n'ulo eze Juda gābu ndi emeworo ka ha pukuru ndi-isi eze Babilon, ndinyom ahu ganāsi kwa, Ndi gi na ha di n'udo akpaliwo gi, we nwe ike n'aru gi: ukwu-gi abua emiwo n'apiti, ha we laghachi azu.
23. Ọ bu kwa ndinyom-i nile na umu-gi ka ha ganēme ka ha pukuru ndi Kaldea: gi onwe-gi agaghi-ewepuga onwe-gi n'aka-ha, kama aka eze Babilon gējide gi: ọ bu kwa obodo a ka i gēsure n'ọku.
24. Zedekaia we si Jeremaia, Ekwela ka onye ọ bula mara okwu ndia, i gaghi-anwu kwa.