Jeremaia 38:11-19 Bible Nso (IGBOB)

11. Ebed-melek we chiri ndikom ahu n'aka-ya, ba n'ulo eze n'okpuru ulo-àkù, chiputa n'ebe ahu nkirika ákwà nke dọkara adọka na nkirika ákwà nke kara nká, o we chiri udọ̀ radara ha Jeremaia n'olùlù ahu.

12. Ebed-melek, bú onye Etiopia, we si Jeremaia, Biko, tiye nkirika ákwà ndia nke dọkara adọka na nke kara nká n'okpuru nkpa-abu-gi abua n'okpuru udọ̀. Jeremaia we me otú a.

13. Ha we chiri udọ̀ ahu dọgota Jeremaia, we me ka o si n'olùlù ahu rigoputa: Jeremaia we nọgide n'ogige ulo-nche ahu.

14. Eze, bú Zedekaia, we ziga, kutara onwe-ya Jeremaia, bú onye-amuma, rue nbata nke-atọ nke di n'ulo Jehova: eze we si Jeremaia, Mu onwem gaje iju gi otù ihe; ezonarilam ihe ọ bula.

15. Jeremaia we si Zedekaia, Mb͕e m'gēgosi gi, ì gaghi-eme ka m'nwua n'ezie? ọzọ, mb͕e m'gādu gi ọdu, i gaghi-egem nti.

16. Eze, bú Zedekaia, we ṅuara Jeremaia iyi na nzuzo, si, Jehova nādi ndu, bú Onye ahu nke nyere ayi ndu a, m'gaghi-eme ka i nwua ma-ọli, m'gaghi-enye kwa gi ma-ọli n'aka ndikom ndia ndi nāchọ ndu-gi.

17. Jeremaia we si Zedekaia, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, siri: Ọ buru na i gāpukuru ndi-isi eze Babilon n'ezie, nkpuru-obi-gi gādi kwa ndu, agaghi-esure kwa obodo a n'ọku; i gādi kwa ndu, gi onwe-gi na ulo-gi:

18. ma ọ buru na i pukughi ndi-isi eze Babilon, agēnye kwa obodo a n'aka ndi Kaldea, ha gēsure kwa ya n'ọku, gi onwe-gi agaghi-ewepuga onwe-gi n'aka-ha.

19. Eze, bú Zedekaia, we si Jeremaia, Mu onwem nātu egwu ndi-Ju ndi dakuruworo ndi Kaldea, na ha gēnyem n'aka-ha, ha ewe kwam emò.

Jeremaia 38