Jeremaia 38:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Shefataia nwa Matan, na Gedalaia nwa Pashua, na Jukal nwa Shelemaia, na Pashua nwa Malkija, we nuru okwu nile nke Jeremaia nāgwa ndi Israel nile, si,

2. Otú a ka Jehova siri, Onye nānọgide n'obodo a gānwu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: ma onye nāpukuru ndi Kaldea gādi ndu, ndu-ya ewe ghọrọ ya ihe-nkwata, o we di ndu.

3. Otú a ka Jehova siri, Aghaghi inye obodo a n'aka usu-ndi-agha nke eze Babilon, ọ gēwere kwa ya.

4. Ndi-isi we si eze, Biko, ka eme ka nwoke a nwua; n'ihi na ya onwe-ya nēme ka aka ndi-agha kuda, bú ndi fọduru n'obodo a, na aka ndi Israel nile, n'igwa ha okwu dika okwu ndia: n'ihi na nwoke a adighi-achọrọ ndi nka udo, kama ọ bu ihe ọjọ.

5. Eze, bú Zedekaia, we si, Le, onye ahu di n'aka-unu: n'ihi na eze abughi onye puru ime ihe ọ bula megide unu.

Jeremaia 38