Jeremaia 36:26-31 Bible Nso (IGBOB)

26. Eze we nye Jeramil nwa eze na Seraia nwa Azriel na Shelemaia nwa Abdeel iwu iwere Beruk, bú ode-akwukwọ, Jeremaia, bú onye-amuma: ma Jehova zobere ha.

27. Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, mb͕e eze suresiri akwukwọ-npiakọta ahu, na okwu nile nke Beruk deputara n'ọnu Jeremaia, si,

28. Were kwa n'onwe-gi akwukwọ-npiakọta ọzọ, dekwasi na ya okwu mbu nile nke di n'elu akwukwọ-npiakọta mbu, nke Jehoiakim, bú eze Juda, sureworo ọku.

29. Ma i gēkwu okwu bayere Jehoiakim, bú eze Juda, si, Otú a ka Jehova siri: Gi onwe-gi esurewo akwukwọ-npiakọta nka ọku, si, Gini mere i ji dekwasi n'akwukwọ a, si, Eze Babilon aghaghi ibia bibie ala nka, me ka madu na anumanu kwusi nime ya?

30. N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere Jehoiakim, bú eze Juda, si: Ọ gaghi-enwe onye ganānọkwasi n'oche-eze Devid: ọzọ, ozu-ya gābu ihe etufuworo nye ọkpukpọ-nku n'ehihie, nye kwa ọtutu-oyi n'abali.

31. M'gēji kwa ajọ omume-ha leta ya, leta kwa nkpuru-ya, leta kwa ndi-orù-ya; M'gēme kwa ka ihe ọjọ ahu nile nke M'gwara ha, ma ha anughi, biakwasi ha, biakwasi kwa ndi bi na Jerusalem, biakwasi kwa ndi Juda.

Jeremaia 36