Jeremaia 35:6-18 Bible Nso (IGBOB)

6. Ha we si, Ayi agaghi-aṅu manya-vine: n'ihi na Jonadab nwa Rikab, bú nna-ayi, nyere ayi iwu, si, Unu aṅula manya-vine, unu onwe-unu, na umu-unu, rue mb͕e ebighi-ebi:

7. unu ewu-kwa-la ulo, unu agha-kwa-la nkpuru, unu aku-kwa-la ubi-vine, unu enwe-kwa-la ihe ndia: kama ọ bu n'ulo-ikwū ka unu gēbi ubọchi nile nke unu; ka unu we di ndu ọtutu ubọchi n'elu ala ahu ebe unu onwe-unu bu ndi-ọbìa.

8. Ayi we ge nti olu Jonadab nwa Rikab, bú nna-ayi, n'ihe nile nke o nyere ayi n'iwu, ighara iṅu manya-vine ubọchi nile ayi, ayi onwe-ayi, na ndinyom-ayi, na umu-ayi ndikom, na umu-ayi ndinyom;

9. na ighara iwu ulo ka ayi we biri nime ha: ọ dighi kwa ubi-vine, ma-ọbu ubi, ma-ọbu nkpuru-ọghigha ayi nwere:

10. ayi we biri n'ulo-ikwū, we ge nti, me dika ihe nile si di nke Jonadab, bú nna-ayi, nyere ayi n'iwu.

11. O rue, mb͕e Nebukadreza, bú eze Babilon, rigotara n'ala nka, na ayi siri, Bianu, ka ayi ba na Jerusalem n'ihi usu-ndi-agha nke ndi Kaldea, na n'ihi usu-ndi-agha nke Siria; ayi we biri na Jerusalem.

12. Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,

13. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Je, si ndi Juda, si kwa ndi bi na Jerusalem, Ùnu agaghi-anara idọ-aka-na-nti ige nti okwum nile? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

14. Emewo ka okwu nile nke Jonadab nwa Rikab guzosie ike, bú nke o nyere umu-ya n'iwu, ka ha ghara iṅu manya-vine, ha aṅughi kwa manya-vine rue ta, n'ihi na ha anuwo ihe nke nna-ha nyere n'iwu: ma Mu onwem agwawo unu okwu, nēbili n'isi-ututu nēkwu; ma unu egeghm nti.

15. M'we zitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n'isi-ututu nēzite ha, si, Biko, sinu, onye ọ bula n'uzọ ọjọ ya, lata, me-kwa-nu ka omume nile unu di nma, unu ejeso-kwa-la chi ọzọ ifè ha, biri-kwa-nu n'ala nka nke M'nyere unu, nye kwa nna-unu-hà: ma unu atọghi nti-unu n'ala, unu egeghkwam nti.

16. N'ihi na umu Jonadab nwa Rikab emewo ka ihe ahu nna-ha nyere n'iwu guzosie ike, bú nke o nyere ha n'iwu, ma ndi nka egeghm nti;

17. n'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ ahu nile biakute Juda, biakute kwa ndi nile bi na Jerusalem, bú nke M'kwuworo megide ha: n'ihi na agwawom ha okwu, ma ha anughi; M'we kpọ ha òkù, ma ha azaghi.

18. Jeremaia we si ulo ndi Rikab, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: N'ihi na unu egewo nti ihe Jonadab, bú nna-unu, nyere n'iwu, unu we debe ihe nile o nyere n'iwu, unu we me dika ihe nile si di nke o nyere unu n'iwu;

Jeremaia 35