5. M'we che n'iru umu ulo ndi Rikab ọkwa ufọdu juputara na manya-vine na iko ufọdu, m'we si ha, Ṅuanu manya-vine.
6. Ha we si, Ayi agaghi-aṅu manya-vine: n'ihi na Jonadab nwa Rikab, bú nna-ayi, nyere ayi iwu, si, Unu aṅula manya-vine, unu onwe-unu, na umu-unu, rue mb͕e ebighi-ebi:
7. unu ewu-kwa-la ulo, unu agha-kwa-la nkpuru, unu aku-kwa-la ubi-vine, unu enwe-kwa-la ihe ndia: kama ọ bu n'ulo-ikwū ka unu gēbi ubọchi nile nke unu; ka unu we di ndu ọtutu ubọchi n'elu ala ahu ebe unu onwe-unu bu ndi-ọbìa.
8. Ayi we ge nti olu Jonadab nwa Rikab, bú nna-ayi, n'ihe nile nke o nyere ayi n'iwu, ighara iṅu manya-vine ubọchi nile ayi, ayi onwe-ayi, na ndinyom-ayi, na umu-ayi ndikom, na umu-ayi ndinyom;
9. na ighara iwu ulo ka ayi we biri nime ha: ọ dighi kwa ubi-vine, ma-ọbu ubi, ma-ọbu nkpuru-ọghigha ayi nwere:
10. ayi we biri n'ulo-ikwū, we ge nti, me dika ihe nile si di nke Jonadab, bú nna-ayi, nyere ayi n'iwu.
11. O rue, mb͕e Nebukadreza, bú eze Babilon, rigotara n'ala nka, na ayi siri, Bianu, ka ayi ba na Jerusalem n'ihi usu-ndi-agha nke ndi Kaldea, na n'ihi usu-ndi-agha nke Siria; ayi we biri na Jerusalem.
12. Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,