Jeremaia 35:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site Jehova n'ubọchi Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si,

2. Je n'ulo ndi Rikab, gwa ha okwu, me ka ha bata n'ulo Jehova, n'otù n'ime-ulo-ya, me ka ha ṅua manya-vine.

3. M'we kuru Jeazanaia nwa Jeremaia, nwa Habazinaia, na umu-nne-ya, na umu-ya ndikom nile, na ulo nile nke ndi Rikab;

4. m'we me ka ha bata n'ulo Jehova, n'ime-ulo umu Henan nwa Igdalaia, bú onye nke Chineke, nke di n'akuku ime-ulo ndi-isi, nke di n'elu ime-ulo Maaseia nwa Shalum, bú onye-nche nke nbata-uzọ:

5. M'we che n'iru umu ulo ndi Rikab ọkwa ufọdu juputara na manya-vine na iko ufọdu, m'we si ha, Ṅuanu manya-vine.

6. Ha we si, Ayi agaghi-aṅu manya-vine: n'ihi na Jonadab nwa Rikab, bú nna-ayi, nyere ayi iwu, si, Unu aṅula manya-vine, unu onwe-unu, na umu-unu, rue mb͕e ebighi-ebi:

7. unu ewu-kwa-la ulo, unu agha-kwa-la nkpuru, unu aku-kwa-la ubi-vine, unu enwe-kwa-la ihe ndia: kama ọ bu n'ulo-ikwū ka unu gēbi ubọchi nile nke unu; ka unu we di ndu ọtutu ubọchi n'elu ala ahu ebe unu onwe-unu bu ndi-ọbìa.

Jeremaia 35