5. n'udo ka i gānwu; ọzọ, nsure nile nke nna-gi-hà, bú ndi-eze mbu, ndi buru gi uzọ, otú a ka ha gēsurere gi ihe; ọzọ, Éwù, onye-nwe-ayi! ka ha gāsi n'itiri gi aka n'obi; n'ihi na okwu ka Mu onwem kwuworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
6. Jeremaia, bú onye-amuma, we gwa Zedekaia, bú eze Juda, okwu ndia nile nime Jerusalem,
7. mb͕e usu-ndi-agha nke eze Babilon nēbuso Jerusalem, nēbuso kwa obodo Juda nile fọduru, agha, bú Lekish na Azeka; n'ihi na nání ndia fọduru nime obodo nile nke Juda, bú obodo ewusiri ike.
8. Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Zedekaia, bú eze, na ndi Israel nile ndi nọ Jerusalem, b͕asiri ndu, ikpọsara ha si na ha nwere onwe-ha;
9. na ha nile gēzilaga, onye ọ bula orù-ya nwoke, na onye ọ bula nwanyi nējere ya ozi, nke bu nwoke Hibru ma-ọbu nwanyi Hibru, inwere onwe-ya; ka madu we ghara ime ka ha fè ya òfùfè-orù, onye ọ bula o me ka onye-Ju, bú nwa-nne-ya, fè ya:
10. ndi-isi nile na ndi Israel nile we nuru, bú ndi bàra n'ọb͕ub͕a-ndu ahu, izilaga, onye ọ bula orù-ya nwoke, na onye ọ bula nwanyi nējere ya ozi, inwere onwe-ha, ka madu ọ bula we ghara ime kwa ka ha fè ya òfùfè-orù ọzọ; ha we nuru, zilaga ha:
11. ma emesia ha chighariri, me ka ndi-orù-ha ndikom na ndinyom ndi nējere ha ozi, bú ndi ha zilagarari inwere onwe-ha, lata, ha we buda ha ka ha buru orù-ndikom na ndinyom nējere ha ozi:
12. okwu Jehova we rue Jeremaia nti site na Jehova, si,
13. Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Mu onwem na nna-unu-ha b͕ara ndu n'ubọchi M'mere ka ha si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta, si,
14. N'ọgwugwu arọ asa unu gēzilaga, onye ọ bula nwa-nne-ya, bú onye-Hibru, nke rere onwe-ya n'aka-gi, we fè gi arọ isi, i gēzilaga ya inwere onwe-ya: ma nna-unu-hà egeghm nti, ha atọghi kwa nti-ha n'ala.