Jeremaia 33:12-21 Bible Nso (IGBOB)

12. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: N'ebe a, nke bu nkpọnkpọ ebe, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu nēbi nime ya, na n'obodo-ya nile, ka ebe-obibi nke ndi-ọzùzù-aturu ndi nēme ka ìgwè ewu na aturu-ha makpu gādi kwa ọzọ.

13. N'obodo nile nke ugwu, na n'obodo nile nke ebe di ala ala, na n'obodo nile nke Negeb, na n'ala Benjamin, na n'ebe nile nke di Jerusalem buruburu, na n'obodo nile nke Juda, ka ìgwè ewu na aturu gāgabiga kwa ọzọ n'okpuru aka abua nke onye nāgu ha ọnu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

14. Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka ezi okwu ahu guzosie ike, bú nke M'gwaworo ulo Israel, nke M'kwuwo-kwa-ra bayere ulo Juda.

15. N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, ka M'gēme ka Ihe-opupú nke ezi omume puere Devid; ọ gēme kwa ihe ekpere n'ikpe na ezi omume n'ala nka.

16. N'ubọchi ahu ka agāzọputa Juda, Jerusalem gēbi kwa na ntukwasi-obi: nka bu kwa aha nke agākpọ ya, Jehova bu ezi omume-ayi.

17. N'ihi na otú a ka Jehova siri: Agaghi-ebipu n'ulo Devid onye nwe inọkwasi n'oche-eze ulo Israel;

18. ọzọ, agaghi-ebipu n'ulo ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, n'irum onye nwe isure àjà-nsure-ọku, na isure onyinye-inata-iru-ọma dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì, utọ, na ichu àjà ubọchi nile.

19. Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,

20. Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na unu gēmebi ọb͕ub͕a-ndum nke ehihie, na ọb͕ub͕a-ndum nke abali, ka ehihie na abali we ghara id i na mb͕e-ha;

21. ya bu na agēmebi ọb͕ub͕a-ndum, nke Mu na Devid, bú orùm, b͕ara, ka o we ghara inwe nwa-nwoke nke bu eze n'elu oche-eze-ya; na ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi Livai, bú ndi-nchu-àjà, ndi nējerem ozi, b͕ara.

Jeremaia 33