8. Hanamel nwa nwa-nne nnam we biakutem, dika okwu Jehova si di, rue ogige ulo-nche, sim, Biko, zuru ubim nke di n'Anatot, nke di n'ala Benjamin: n'ihi na gi ka nnweta-ya ruru, ọ bu kwa gi nwe nb͕aputa-ya; zutara onwe-gi. M'we mara na okwu Jehova ka nka bu.
9. M'we zuru ubi ahu n'aka Hanamel nwa nwa-nne nnam, bú nke di n'Anatot, m'we tùara ya ego-ya, bú shekel iri na asa nke ọla-ọcha.
10. M'we de aham n'akwukwọ ala ahu, ka ya akàrà, kpọ ndi-àmà, tùara ya ego ahu n'ihe-ọtùtù.
11. M'we were akwukwọ nzuta-ala ahu, ma nke akara akàrà, nke ihe-ya enyere n'iwu na ukpuru-ya nile di nime ya, ma nke ghere oghe: