Jeremaia 31:22-32 Bible Nso (IGBOB)

22. Rùe ole mb͕e ka i ganēje iru na azu, gi ada nke nādaghachi azu? n'ihi na Jehova ekèwo ihe -ohu n'uwa, Nwanyi gānọ nwoke buruburu.

23. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ha gēkwu kwa okwu a ọzọ n'ala Juda, na n'obodo-ya nile, mb͕e m'gēme ka ndi-ya adọtara n.agha lata, si: Jehova gọzie gi, gi ebe-obibi nke ezi omume, gi ugwu nke idi-nsọ.

24. Juda na obodo-ya nile gēbikọ nime ya n'otù; ndi-ubi, na ndi nāchiri ìgwè aturu-ha bulie ije.

25. N'ihi na emewom ka afọ jubiga nkpuru-obi nāda #mbà ókè, ọ bu kwa nkpuru-obi ọ bula nke nēru újú ka M'juworo.

26. Mb͕e nka gasiri m'we teta, we hu; uram we tọm utọ.

27. Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gagha nkpuru madu na nkpuru anumanu n'ulo Israel na n'ulo Juda.

28. Ọ gēru kwa na, dika M'muworo anya n'aru ha iropu na ikwada, na itikpọ na ime ka ala n'iyì, na imejọ; otú a ka M'gāmu anya n'aru ha iwu ulo na iku ihe n'ubi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

29. N'ubọchi ahu ha agaghi-asi kwa ọzọ, Nna-ayi-hà eriwo nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé umu-ha we nēru izìzì.

30. Kama onye ọ bula gānwu n'ihi ajọ omume nke aka ya: madu ọ bula nke nēri nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé-ya ganēru izìzì.

31. Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e Mu na ulo Israel na ulo Juda gāb͕a ọb͕ub͕a-ndu ọhu:

32. ọ bughi dika ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara n'ubọchi M'jidere ha n'aka ime ka ha si n'ala Ijipt puta; n'ihi na ha onwe-ha mebiri ọb͕ub͕a-ndum ahu, ọ bu ezie na Mu onwem bu di nwe ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Jeremaia 31