Jeremaia 3:14-22 Bible Nso (IGBOB)

14. Latanu, umu nke nādaghachi azu, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; n'ihi na Mu onwem bu di nwe unu: M'gēwere kwa unu, otù site n'otù obodo, abua site n'otù ab͕uru, M'gēme kwa ka unu biarue Zaion:

15. M'gēnye kwa unu ndi-ọzùzù-aturu dika obim si di, ndi gēji ihe-ọmuma na inwe-uche azù unu.

16. O gēru kwa, mb͕e unu baworo uba, mu kwa ọmùmù n'ala-unu, n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ha agaghi-asi ọzọ, Ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova; ọ gaghi-abà kwa n'obi: ha agaghi-echeta kwa ya; ha agaghi-eleta kwa ya; agaghi-eme kwa ya ọzọ.

17. Na mb͕e ahu ka ha gākpọ Jerusalem oche-eze Jehova; agāchikọta kwa mba nile rue ya, inye aha Jehova, rue Jerusalem: ha agaghi-ejeso kwa isi-ike nke obi ọjọ ha.

18. N'ubọchi ahu ulo Juda gējekuru ulo Israel, ha gāyikọ kwa bia site n'ala Ugwu rue ala ahu nke M'mere ka nna-unu-hà keta.

19. Ma Mu onwem siri, M'gēsi aṅa tiye gi n'etiti umu, we nye gi ala anāchọsi ike, ihe-nketa nke mara nma nke usu nile nke mba di iche? M'we si, Nnam ka unu gākpọm; unu agaghi-esi kwa n'isom laghachi azu.

20. N'ezie dika nwayi si ewere nghọb͕u rapu di-ya, otú a ka unu ghọb͕uworom, unu ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

21. Olu ka anuru n'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi, bú ikwa-ákwá na aririọ-amara nile nke umu Israel; n'ihi na ha emewo ka uzọ-ha gbagọ, ha echezọwo Jehova, bú Chineke-ha.

22. Latanu, umu nke nādaghachi azu, M'gāgwọ ndaghachi-azu nile nke unu. Le ayi anya, ayi abiakutewo Gi; n'ihi na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chineke-ayi.

Jeremaia 3