Jeremaia 28:7-13 Bible Nso (IGBOB)

7. Nání, biko, nuru okwua nke mu onwem nēkwu na nti-gi abua, na na nti ndi nka nile:

8. Ndi-amuma ndi burum uzọ, ndi buru kwa gi uzọ, site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ha we bue amuma megide ọtutu ala, megide kwa ala-eze uku di iche iche, bayere agha, baye-kwa-ra ihe ọjọ, baye-kwa-ra ajọ ọria nēfe efe.

9. Onye-amuma nke nēbu amuma bayere udo, mb͕e okwu onye-amuma ahu gērè, agāmara onye-amuma ahu, na Jehova ezitewo ya n'ezie.

10. Hananaia, bú onye-amuma, we kopu nkpọrọ ahu n'olu Jeremaia, bú onye-amuma, we b͕ajie ya.

11. Hananaia we kwue okwu n'anya ndi Israel nile, si, Otú a ka Jehova siri: Ọbuná otú a ka M'gāb͕ajipu yoke nke Nebukadneza, bú eze Babilon, n'olu mba nile tutu ogologo arọ abua eruzue. Jeremaia, bú onye-amuma, we la.

12. Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, mb͕e Hananaia, bú onye-amuma, b͕ajipusiri nkpọrọ n'olu Jeremaia, bú onye-amuma, si,

13. Je, gwa Hananaia okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Nkpọrọ osisi ka i b͕ajiworo; ma i mewo nkpọrọ ígwè n'ọnọdu ha.

Jeremaia 28