Jeremaia 28:12-15 Bible Nso (IGBOB)

12. Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, mb͕e Hananaia, bú onye-amuma, b͕ajipusiri nkpọrọ n'olu Jeremaia, bú onye-amuma, si,

13. Je, gwa Hananaia okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Nkpọrọ osisi ka i b͕ajiworo; ma i mewo nkpọrọ ígwè n'ọnọdu ha.

14. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Yoke nke ígwè ka M'tukwasiworo n'olu mba nile ndia, ka ha we fè Nebukadneza, bú eze Babilon; ha gēfè kwa ya: ọzọ, anu ọhia ka M'nyeworo ya.

15. Jeremaia, bú onye-amuma, we si Hananaia, bú onye-amuma, Biko, nuru, Hananaia; Jehova eziteghi gi; ma gi onwe-gi emewo ka ndi nka tukwasi okwu-ugha obi.

Jeremaia 28