1. O rue, n'arọ ahu, na nmalite ọbubu-eze Zedekaia, bú eze Juda, n'arọ nke-anọ, n'ọnwa nke-ise, na Hananaia nwa Azua, bú onye-amuma, nke sitere na Gibeon, gwaram okwu n'ulo Jehova, n'anya ndi-nchu-àjà na ndi Israel nile, si,
2. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru, si, Ab͕ajiwom yoke nke eze Babilon.
3. Tutu ogologo arọ abua eruzue Mu onwem ganēbulata nēbe a ihe nile nke ulo Jehova, nke Nebukadneza, bú eze Babilon, siri n'ebe a bupu, we bubà ha na Babilon: