Jeremaia 27:16-20 Bible Nso (IGBOB)

16. Ọ bu kwa ndi-nchu-àjà na ndi nka nile ka m'gwara okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Unu egela nti okwu nile nke ndi-amuma-unu ndi nēburu unu amuma, si, Le, agaje isi na Babilon welata ihe nile nke ulo Jehova ub͕u a ngwa ngwa: n'ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu.

17. Unu egela ha nti; fènu eze Babilon, we di ndu: n'ìhi gini ka obodo a gāghọ nkpọnkpọ ebe?

18. Ma ọ buru na ndi-amuma ka ha bu, ọ buru na okwa na okwu Jehova di ha n'ọnu, biko, ka ha riọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha aririọ, ka ihe nile nke fọduru n'ulo Jehova, na n'ulo eze Juda, na nime Jerusalem, we ghara ibà na Babilon.

19. N'ihi na okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru bayere ogidi nile, baye-kwa-ra oké osimiri ahu, baye-kwa-ra ihe-ndọkwasi nile, baye-kwa-ra ihe fọduru, bú nke fọduru n'obodo a,

20. nke Nebukadneza, bú eze Babilon, nāchighi, mb͕e o mere ka Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, si na Jerusalem je biri na Babilon, ya na ndi Juda na Jerusalem nile amara aha-ha;

Jeremaia 27