Jeremaia 25:34-37 Bible Nso (IGBOB)

34. Kwasienu ákwá ike, unu ndi-ọzùzù-aturu, ti-kwa-nu nkpu; turu-kwa-nu na ntu, unu ndi di ebube n'etiti ìgwè ewu na aturu: n'ihi na ubọchi-unu eruzuwo ka eb͕ue unu, M'gākpasa kwa unu, unu gāda kwa dika ihe anāchọsi ike.

35. Ebe-nb͕alaga alanariwo kwa ndi-ọzùzù-aturu, nb͕apu alanariwo ndi di ebube n'etiti ìgwè ewu na aturu.

36. Ge nti olu iti-nkpu nke ndi-ọzùzù-aturu, na nke ikwasi-ákwá-ike nke ndi di ebube n'etiti ìgwè ewu na aturu! n'ihi na Jehova nēbibi ebe-ita-nri-ha.

37. Emewo kwa ka ulo-obibi nile nke di n'udo dere du site n'iwe di ọku nke Jehova.

Jeremaia 25