Jeremaia 24:5-9 Bible Nso (IGBOB)

5. Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri; Dika ezi fig ndia, otú a ka M'gāmata ndi Juda emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi M'siri n'ebe a ziga n'ala ndi Kaldea, ime ha nma.

6. N'ihi na M'gātukwasi ha anyam ime ha nma, M'gēme kwa ka ha lata n'ala nka: M'gēwu kwa ha dika ulo, ghara ikwada ha; M'gāku kwa ha dika osisi, ghara iropu ha.

7. M'gēnye kwa ha obi imaram, na Mu onwem bu Jehova: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke: n'ihi na ha gēji obi-ha nile laghachikutem.

8. Ma dika fig ọjọ ndia, nke anāgaghi-eri eri, site n'ijọ-njọ-ha; n'ezie otú a ka Jehova siri, Otú a ka M'gēwere Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-isi-ya, na ndi Jerusalem fọduru, bú ndi fọduru n'ala nka, na ndi bi n'ala Ijipt, nye:

9. M'gēwere ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, iburu ha ihe ọjọ; ibu ihe-ita-uta, na ilu, na ihe-àkùkù, na ihe-nkọcha, n'ebe nile M'gāchusa ha.

Jeremaia 24