Jeremaia 23:20-32 Bible Nso (IGBOB)

20. Iwe Jehova agaghi-alaghachi azu, rue mb͕e O mere ya, ru kwa mb͕e O mere ka ihe-nzube nile nke obi-Ya guzosie ike: na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia unu gāghọta ya nke-ọma.

21. Eziteghm ndi-amuma ahu, ma ha onwe-ha b͕ara ọsọ: agwaghm ha okwu, ma ha onwe-ha buru amuma.

22. Ma ọ buru na ha guzori n'ìzù nzuzo nkem, ha gēmewori ka ndim nuru okwum nile, ha gēmewori kwa ka ha si n'uzọ ọjọ ha na n'ihe ọjọ nke omume nile ha, lata.

23. Ọ̀ bu Chineke nke nọ nso ka M'bu, ghara ibu Chineke nọ n'ebe di anya? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

24. Ọ̀ di onye ọ bula gēzobe onwe-ya n'ebe ọ bula di nzuzo, Mu onwem we ghara ihu ya anya? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ọ̀ bughi elu-igwe na uwa ka M'juputara? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

25. Anuwom ihe ahu nke ndi-amuma siri, bú ndi nēbu amuma agha n'aham, si, Arọwom nrọ, arọwom nrọ.

26. Rùe ole mb͕e ka nka gādi n'obi ndi-amuma ndi nēbu amuma ugha; bú ndi-amuma nke nēbu amuma aghughọ nke obi-ha?

27. Ndi nēchè èchìchè ime ka ndim chezọ aham site na nrọ nile ha nke ha nēzeritara ibe-ha n'otù n'otù, dika ndi bu nna-ha chezọrọ aham site na Beal.

28. Onye-amuma nke nrọ di ya n'ọnu, ya ze nrọ-ya; ọzọ, onye ahu okwum di ya n'ọnu, ya kwue okwum n'ezi-okwu. Gini ka okporo-ọka na ọka wheat nwekọrọ? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

29. Ọ̀ bughi otú a ka ọ di? na okwum di ka ọku, (ọ bu ihe sin'ọnu Jehova puta); na dika otùtù nke nētipia nkume di elu?

30. N'ihi nka, le, Mu nēmegide ndi-amuma, (ọbu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ndi nēzu okwum nile n'ori, onye ọ bula n'aka ibe-ya.

31. Le, Mu nēmegide ndi-amuma, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ndi nēwere ire-ha kwue ihe, si, Ọ bu ihe si Ya n'ọnu puta.

32. Le, Mu nēmegide ndi nēbu amuma nrọ ugha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha we ze ha, me ka ndim kpafue site n'okwu-ugha nile ha na n'obi-ha nādighi n'otù ebe: ma Mu onwem eziteghi ha, enyeghkwam ha iwu; ọ dighi kwa urù ha gābara ndi nka ma-ọli; ọ bu ihe si n'onu Jehova puta.

Jeremaia 23