2. N'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke Israel, ji kwue okwu di otú a megide ndi-ọzùzù-aturu ndi nāzù ndim dika aturu, si: Unu onwe-unu akpasawo ìgwè ewu na aturu nkem, chusa ha, unu elekọtaghi kwa ha; le, M'gaje iwere ihe ọjọ nke omume nile unu leta unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
3. Mu onwem gāchikọta kwa ìgwè ewu na aturu nkem fọduru site n'ala nile ebe M'chusaworo ha, M'gēme kwa ka ha lata n'ebe-ita-nri-ha; ha gāmu kwa ọmùmù, ba uba.
4. M'gēme kwa ka ndi-ọzùzù-aturu biliere ha, ndi gāzù ha: ha agaghi-atu kwa egwu ọzọ, ha agaghi-atu kwa ujọ, agaghi-ele kwa anya otù efu nime ha na o furu efu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
5. Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka Ihe-opupú nke nēme ezi omume biliere Devid, otù Eze gābu kwa eze, ọ gēnwe kwa uche, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume n'ala nka.
6. N'ubọchi-ya ka agāzọputa Juda, Israel gēbi kwa na ntukwasi-obi: nka bu kwa aha-ya agākpọ ya, Jehova bu ezi omume-ayi.
7. N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ha agaghi-asi kwa ọzọ, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka umu Israel si n'ala Ijipt rigoputa;
8. kama ha gāsi, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka nkpuru ulo Israel si n'ala Ugwu na n'ala nile ebe M'chusara ha-ri rigoputa, bata; ha gēbi kwa n'elu ala nke aka ha.
9. Okwu bayere ndi-amuma. Obim tiwara etiwa nimem, ọkpukpum nile emewo nkpatu; adiwom ka onye ṅubigaworo manya ókè, na dika nwoke nke manya-vine bàworo n'anya nke-uku; n'ihi Jehova, na n'ihi okwu nsọ Ya nile.
10. N'ihi na ala nka juputara na ndi nākwa iko; n'ihi na site n'ọb͕ub͕a-iyi ala nka nēru újú; ebe-ita-nri nile nke ọzara akpọwo nku; ọb͕ub͕a-ọsọ-ha di kwa njọ, idi-ike-ha abughi kwa ihe ziri ezi.
11. N'ihi na emeruwo ma onye-amuma ma onye-nchu-àjà; e, n'ulom ka M'chọputaworo ihe ọjọ ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
12. N'ihi nka uzọ-ha gādi ha ka ebe nālọ alọ n'oké ọchichiri: agāchu ha, ha ewe dabà nime ya: n'ihi na M'gēme ka ihe ọjọ biakwasi ha, n'arọ nleta-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
13. Ọ bu kwa n'aru ndi-amuma Sameria ka M'huworo ihe-nzuzu; ha jiri Beal bu amuma, we me ka ndim, bú Israel, kpafue.
14. Ọzọ, n'aru ndi-amuma Jerusalem ka M'huworo ihe jọb͕uru onwe-ya; ha nākwa iko, nējeghari kwa n'okwu-ugha, ha emewo kwa ka aka ndi nēme ihe ọjọ di ike, ha we ghara isi, onye ọ bula n'ihe ọjọ ya, lata: ha nile aghọworom ihe di ka Sọdọm, ndi bi nime ya aghọwo-kwa-ram ihe di ka Gọmọra.
15. N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji kwue okwu di otú a bayere ndi-amuma ndia, si: Le, M'gaje ime ka ha rie wormwood, M'gēme kwa ka ha ṅua miri ńsí; n'ihi na ndi-amuma nke Jerusalem ka nmeru puworo je rue ala nka nile.
16. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Unu egela nti n'okwu nile nke ndi-amuma ahu ndi nēburu unu amuma; ndi nēme unu ihe-efu ka ha bu: ọhù nke obi-ha ka ha nēkwu, ha adighi-ekwu site n'ọnu Jehova.