Jeremaia 23:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ahuhu gādiri ndi-ọzùzù-aturu ndi nēme ka ìgwè ewu na aturu nke ebe-ita-nrim la n'iyì, kpasa ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

2. N'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke Israel, ji kwue okwu di otú a megide ndi-ọzùzù-aturu ndi nāzù ndim dika aturu, si: Unu onwe-unu akpasawo ìgwè ewu na aturu nkem, chusa ha, unu elekọtaghi kwa ha; le, M'gaje iwere ihe ọjọ nke omume nile unu leta unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

3. Mu onwem gāchikọta kwa ìgwè ewu na aturu nkem fọduru site n'ala nile ebe M'chusaworo ha, M'gēme kwa ka ha lata n'ebe-ita-nri-ha; ha gāmu kwa ọmùmù, ba uba.

4. M'gēme kwa ka ndi-ọzùzù-aturu biliere ha, ndi gāzù ha: ha agaghi-atu kwa egwu ọzọ, ha agaghi-atu kwa ujọ, agaghi-ele kwa anya otù efu nime ha na o furu efu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

5. Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka Ihe-opupú nke nēme ezi omume biliere Devid, otù Eze gābu kwa eze, ọ gēnwe kwa uche, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume n'ala nka.

Jeremaia 23