9. Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-ha, we kpọ isi ala nye chi ọzọ di iche iche, fè ha.
10. Unu akwalara onye nwuru anwu ákwá, unu egosi-kwa-la ya ebere unu nwere n'aru ya: kwasierenu onye-ije ahu ike; n'ihi na ọ gaghi-alata kwa ọzọ, ọ gaghi-ahu kwa ala amuru ya ọzọ.
11. N'ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere Shalum nwa Josaia, bú eze Juda, nke bu eze n'ọnọdu Josaia, bú nna-ya, nke siri n'ebe a pua, si: Ọ gaghi-alata kwa n'ebe ahu ọzọ;
12. kama n'ebe ahu nke ha mere ya ka ọ je biri, n'ebe ahu ka ọ gānwu, ma ala nka ka ọ nāgaghi-ahu kwa ọzọ.