18. N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si: Ha agaghi-etiri ya aka n'obi, si, Éwù, nwa-nnem nwoke! ma-ọbu, Éwù, nwa-nnem nwanyi! ha agaghi-etiri ya aka n'obi, si, Éwù, onye-nwe-ayi! ma-ọbu, Éwù, ebube-ya!
19. Olìlì nke inyinya-ibu ka agēji lìe ya, agādọrọ ya, tufue ya n'ebe di anya n'azu ọnu-uzọ-ama Jerusalem.
20. Rigo na Lebanon, ti kwa nkpu; me kwa ka olu-gi da udà na Beshan: si kwa n'Abarim tie nkpu; n'ihi na etipiawo ndi nile nāhu gi-ri n'anya.
21. Agwaram i okwu n'udo-gi; ma i siri, M'gaghi-anu. Nka bu uzọ-gi site na mb͕e i di na nwata, na i geghi nti olum.