Jeremaia 21:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e eze, bú Zedekaia, zigara ya Pashua nwa Malkija, na Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, si,

2. Biko, juara ayi Jehova ase; n'ihi na Nebukadreza, bú eze Babilon, ebusowo ayi agha: eleghi anya Jehova gēmeso ayi dika oké ọlu-Ya nile si di, we me ka o si n'aru ayi rigo la.

3. Jeremaia we si ha, Otú a ka unu gāsi Zedekaia:

4. Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'ganēchighari ihe agha nile nke di n'aka-unu, nke unu onwe-unu ji ebuso eze Babilon na ndi Kaldea agha, bú ndi nānọchigide unu n'agha n'azu mb͕idi obodo, M'gāchikọta kwa ha n'etiti obodo a.

5. Mu onwem gēbuso kwa unu agha n'aka eseteri eseti, na n'ogwe-aka di ike, ọbuná n'iwe, na n'ọnuma, na n'oké iwe.

6. M'gētib͕u kwa ndi bi n'obodo a, ma madu ma anumanu: n'ajọ ọria uku nēfe efe ka ha gānwu.

Jeremaia 21