24. i bu nne-inyinya-ibu-ọhia nke mara ọzara aka; n'ọchichọ nke nkpuru-obi-ya o kubawo ifufe; na mb͕e ọbub͕a-ya ònye gēme ka ọ laghachi azu? ndi nile nke nāchọ ya agaghi-ada #mbà; n'ọnwa-ya ka ha gāchọta ya.
25. B͕ochie ukwu-gi n'ibà ukwu efu, b͕ochi kwa akpiri-gi n'ikpọ-nku: ma i siri, Ntukwasi-obi adigh: é-è; n'ihi na ahuwom ndi ala ọzọ n'anya, ha ka m'gējeso kwa.
26. Dika ihere onye-ori mb͕e anāchọputa ya, otú a ka emeworo ka ihere me ulo Israel; ha onwe-ha, na ndi-eze-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-nchu-aja-ha, na ndi-amuma-ha;
27. ndi nāsi osisi, Nnam ka i bu; nāsi kwa nkume, Gi onwe-gi murum: n'ihi na ha ab͕akutawom azu, ha echeghm iru: ma na mb͕e ọnọdu ọjọ ha ha gasi, Bilie, we zọputa ayi.