Jeremaia 2:2-18 Bible Nso (IGBOB)

2. Je, kpọ òkù na nti nke Jerusalem, si, Otú a ka Jehova siri, Echetawom n'ebe i nọ ebere nke mb͕e i nọ na nwata, ihu-n'anya nke mb͕e aluru gi ọhu: otú i jesorom n'ọzara, n'ala anāghaghi nkpuru.

3. Israel bu ihe nsọ Jehova nwere, nkpuru mbu nke ihe-ọmume-Ya: ikpe gāma ndi nile nke nēripia ya; ihe ọjọ gābiakwasi ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

4. Nurunu okwu Jehova, unu ulo Jekob, na ab͕uru nile nke ulo Israel:

5. otú a ka Jehova siri, Àjọ omume gini ka nna-unu-hà huworo n'arum, na ha esiwo n'ebe M'nọ je n'ebe di anya, we jeso ihe-efu, we ghọ ihe-efu?

6. Ha asighi kwa, Òle ebe Jehova nọ, bú Onye meworo ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa; Onye meworo ka ayi je ije n'ọzara, n'ala nke ebe ihe nādighi na nke olùlù, n'ala ọkpọ-nku na nke onyinyo ọnwu, n'ala nke ọ nādighi onye gabigara nime ya, na nke madu nēbighi n'ebe ahu?

7. M'we me ka unu bata n'ala nke ubi ọma, iri nkpuru-ya na ezi ihe-ya: unu we bata, we merua alam, me ka ihe-nketam ghọ ihe-árú.

8. Ndi-nchu-àjà asighi, Òle ebe Jehova nọ? ọzọ, ndi ji iwum eme ihe amaghm: ndi-ọzùzù-aturu jehie-kwa-ra megidem, ndi-amuma ji-kwa-ra Beal bu amuma, ọ bu kwa ihe nādighi-abà urù ka ha jesoro.

9. N'ihi ya Mu na unu gēkpe kwa ikpe ọzọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), Mu na umu umu-unu gēkpe kwa ikpe.

10. N'ihi na, gabiganu rue agwe-etiti nile nke Kitim, we hu; ziga-kwa-nu na Kida, we chigharia uche nke-uku; hu-kwa-nu ma ihe di otù a adiwo.

11. Ọ̀ di mba ab͕anweworo chi di iche iche ha, ọ bu ezie na ihe ahu abughi chi? ma ndim ab͕anwewo nsọpuru-ha n'ihe nadighi-abà urù.

12. Ka ibodo ihe a nwu a unu n'aru, unu elu-igwe, tuanu oké ujọ, burunu ihe tọb͕ọrọ n'efu nke-uku, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

13. N'ihi na ihe ọjọ abua ka ndim meworo; Mu ka ha rapuworo, bú isi-iyi nke miri nēnye ndu, ka ha we gwuwara onwe-ha olùlù-miri di iche iche, bú olùlù-miri tipúru etipú, nke nānagideghi miri.

14. Israel, ọ̀ bu orù? ọ̀ bu orù amuru n'ulo ka ọ bu? gini mere o ji ghọ ihe-nluta-n'agha?

15. Ya ka umu-ọdum nāb͕o uja, ha ewewo ka olu-ha da udà: ha we me ka ala-ya ghọ ebe tọbọrọ n'efu; esuresiwo obodo-ya nile oku, ha we ghara inwe onye-obibi.

16. Ọzọ, umu Nof na Tahpanhes nērichapu opu-n'isi-gi.

17. Ọ̀ bughi nka ka i nēmere onwe-gi, n'irapu Jehova, bú Chineke-gi, mb͕e Ọ nēme ka i je ije n'uzọ?

18. Ma ub͕u a gini ka i nwere n'uzọ Ijipt, n'iṅu miri Shaihoa? ma-ọbu gini ka i nwere n'uzọ Asiria, n'iṅu miri nke Osimiri ahu?

Jeremaia 2