Jeremaia 18:11-14 Bible Nso (IGBOB)

11. Ma ub͕u a, biko, gwa ndi Juda, gwa kwa ndi bi na Jerusalem, okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Le, Mu onwem nākpu ihe ọjọ megide unu, nēchè kwa èchìchè megide unu: biko, sinu, onye ọ bula n'uzọ ọjọ ya, lata, me kwa ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma.

12. Ma ha siri, Ntukwasi-obi adigh: n'ihi na èchìchè nile nke ayi ka ayi nējeso, ayi nēme kwa, onye ọ bula ihe isi-ike nke obi ọjọ ya.

13. N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Biko, juanu n'etiti mba nile, si, Ònye nuworo ihe di ka ndia? ihe jọb͕uru onwe-ya nke-uku ka nwa-ab͕ọghọ Israel nke nāmaghi nwoke meworo.

14. Snow nke Lebanon, ọ̀ gārapu oké nkume nke ọhia? ma-ọbu miri oyi nke si n'ala ọzọ erù, ọ̀ gātada?

Jeremaia 18