Jeremaia 17:13-18 Bible Nso (IGBOB)

13. olile-anya Israel, ka Jehova bu, ihere gēme ndi nile nārapu Gi: ndi nēsi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha, n'ala ka agēde ha, n'ihi na ha arapuwo isi-iyi nke miri nēnye ndu, bú Jehova.

14. Me ka m'diri ndu, Jehova, m'we diri ndu; zọputam, ewe zọputam: n'ihi otutom ka I bu.

15. Le, ndi ahu nāsim, Òle ebe okwu Jehova di? biko, ya bia.

16. Ma mu onwem, anukpọghm ipu n'iso Gi n'izù aturu; ọzọ, ubọchi nādighi ngwọta, achọsighm ya ike; Gi onwe-gi mara: ihe si n'eb͕ub͕ere-ọnum puta, na ncherita-iru Gi ka ọ diworo.

17. Aghọlam ihe-ujọ: ebe-nb͕abàm ka I bu n'ubọchi ihe ọjọ.

18. Ka ihere me ndi nēsob͕um, ma ka ihere ghara ime mu onwem; ka ndi ahu tua ujọ, ma ka mu onwem ghara itu ujọ: me ka ubọchi ihe ọjọ biakwasi ha, were kwa okpukpu ntipia abua tipia ha.

Jeremaia 17