Jeremaia 14:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova nke ruru Jeremaia nti bayere okwu nb͕ochi miri-ozuzo.

2. Juda eruwo újú, ọnu-uzọ-ama-ya nile atalatawo kwa, ha yiri uwe-nkpe nọdu n'ala; iti-nkpu Jerusalem arigowo.

3. Ndi-ebube-ha ezigawo ndi-ntà-ha ichuta miri: ha abiaruwo olùlù-miri nile, ha achọtaghi miri; ha alatawo n'ite efu: ihere emewo ha, etiyewokwa ha n'ọnọdu-ihere, ha ekpuchiwo kwa isi-ha.

4. N'ihi ala nke b͕awara ab͕awa, n'ihi na oké miri-ozuzo adighi n'ala, ihere emewo ndi-ọlu-ubi, ha ekpuchiwo isi-ha.

5. N'ihi na ọbuná nne-ele amuwo nwa n'ọhia, we rapu ya, n'ihi na ahihia ndu adighi.

6. Inyinya-ibu-ọhia eguzowo kwa n'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi, ha ekubawo ifufe dika nkita-ọhia; anya-ha adalawo n'isi, n'ihi na ihe-ọkukú adighi.

Jeremaia 14