Jeremaia 13:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Otú a ka Jehova sirim, Je, zutara onwe-gi ihe-ọkiké nke flax, tukwasi ya n'úkwù-gi, ma emela ka ọ ba na miri.

2. M'we zuta ihe-ọkiké dika okwu Jehova si di, m'we tukwasi ya n'úkwù.

3. Okwu Jehova we ruem nti nke ub͕ò abua, si,

4. Were ihe-ọkiké ahu nke i zutaworo, nke di n'úkwù-gi, bilie, je Yufretis, zobe ya n'ebe ahu nime nb͕awa nke nkume di elu.

5. M'we je, zobe ya n'akuku Yufretis, dika Jehova nyerem iwu.

6. O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na Jehova sirim, Bilie, je Yufretis, weputa ihe-ọkiké ahu n'ebe ahu, bú nke M'nyere gi iwu izobe n'ebe ahu.

7. M'we je Yufretis, gwue, weputa ihe-ọkiké ahu n'ebe m'zobere ya-ri: ma, le, ihe-ọkiké ahu ebibiwo, ọ bàghi n'ihe ọ bula.

8. Okwu Jehova we ruem nti, si,

9. Otú a ka Jehova siri, Otú a ka M'gēbibi npako Juda na npako bara uba nke Jerusalem.

10. Ndi ọjọ nka ndi nāju inu okwum nile, ndi nējeghari n'isi-ike nke obi-ha, we jeso chi di iche iche ọzọ ifè ha, na ikpọ isi ala nye ha, ndi nka gādi kwa ka ihe-ọkiké a, nke nādighi-abà n'ihe ọ bula.

11. N'ihi na dika ihe-ọkiké nārapara n'úkwù madu, otú a ka M'meworo ka ulo Israel nile na ulo Juda nile rapara n'arum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ka ha we ghọrọm otù ndi, na aha, na otuto, na ima-nma: ma ha anughi.

12. I gāgwa kwa ha okwu a, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Agāb͕aju ite ọ bula manya-vine: ha gāsi kwa gi, Ọ̀ bu na ayi amaghi na agāb͕aju ite ọ bula manya-vine?

13. I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje iwere nṅubiga-manya-ókè mejue ndi nile bi n'ala nka, bú ndi-eze ndi nānọchi Devid n'oche-eze-ya, na ndi-nchu-àjà, na ndi-amuma, na ndi nile bi na Jerusalem.

14. M'gātupia kwa ha, otù onye n'elu ibe-ya, ọbuná ndi bu nna na umu-ha n'otù; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: M'gaghi-enwe ọmiko, M'gaghi-eme kwa ebere, M'gaghi-enwe kwa obi-ebere, ka M'we ghara ibibi ha.

Jeremaia 13