8. Ma ha nile n'otù bu anu-ọhia na ndi-nzuzu: idọ-aka-na-nti nke ihe-efu, nání osisi ka ọ bu.
9. Ọla-ọcha di nke etisaworo mbadamba nke anēsi na Tashish weta, na ọla-edo nke sitere n'Ufaz, bú ọlu onye-ọ̀kà na nke aka onye-nnucha-ọla: ákwà anunu na ákwà ododo bu uwe-oyiyi-ha; ọlu nke ndi mara ihe ka ha nile bu.
10. Ma Jehova bu Chineke n'ezi-okwu; Ya onwe-ya bu Chineke di ndu, na eze nādi mb͕e ebighi-ebi: n'iwe-Ya uwa nāma jijiji, mba nile apughi kwa inagide iwe-Ya di ọku.
11. Otú a ka unu gāsi ha, Chi nile nke nēmeghi elu-igwe na uwa, ha gāla n'iyì pua n'uwa na n'okpuru elu-igwe, bú chi ndia.