Jenesis 7:5-10 Bible Nso (IGBOB)

5. Noa we me dika iwu nile si di nke Jehova nyere ya.

6. Noa b͕ara nnù arọ na ọgu iri mb͕e iju-miri ahu di n'elu uwa.

7. Noa we si n'iru miri nke iju-miri ahu ba n'ub͕ọ ahu, ya na umu-ya ndikom na nwunye-ya na nwunye nile nke umu-ya ndikom.

8. Nime anu di ọcha, na nime anu nke nādighi ọcha, na nime anu-ufe na ihe nile ọ bula nke nākpu akpu n'elu ala,

9. abua abua bakuru Noa n'ub͕ọ ahu, oke na nwunye, dika Chineke nyere Noa iwu.

10. O rue, mb͕e ubọchi asa ahu gasiri, na miri nke iju-miri ahu di n'elu uwa.

Jenesis 7