Jenesis 7:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we si Noa, Ba n'ub͕ọ ahu, gi onwe-gi na ulo-gi nile; n'ihi na gi ka M'huworo bu onye ezi omume n'irum n'ọb͕ọ a.

2. Nime anu nile ọ bula di ọcha i gāchiputara onwe-gi asa asa, oke na nwunye ya; chiputa kwa abua abua n'anu nādighi ọcha, oke na nwunye-ya;

3. ufọdu kwa nime anu-ufe nke elu-igwe, asa asa, oke na nwunye: idebe nkpuru ndu n'elu uwa nile.

Jenesis 7