Jenesis 50:6-13 Bible Nso (IGBOB)

6. Fero we si, Rigo, lìe nna-gi, otú o mere gi ka i ṅua iyi.

7. Josef we rigo ilì nna-ya: ndi-orù Fero nile, na ndi-okenye ulo-ya, na ndi-okenye nile nke ala Ijipt,

8. na ulo Josef nile, na umu-nne-ya, na ulo nna-ya, we so ya rigo: nání umu-ntakiri-ha, na ìgwè ewu na aturu-ha, na ìgwè ehi-ha, ka ha rapuru n'ala Goshen.

9. Ma ub͕o-ala ma ndi inyinya nēbu we so ya rigo: ọmuma-ulo-ikwū ahu we di oké uku.

10. Ha biarue ebe-nzọcha-ọka nke Atad, nke di n'ofè Jọdan, ha we were iti-aka-n'obi di uku di kwa ike nke-uku ti aka n'obi n'ebe ahu: ọ we mere nna-ya oruru-újú ubọchi asa.

11. Ndi bi n'ala ahu, bú ndi Kenean, we hu oruru-újú ahu n'ebe-nzọcha-ọka nke Atad, ha si, Nka buru ndi Ijipt oruru-újú di arọ́: n'ihi nka akpọrọ aha-ya Ebel-Mizraim, nke di n'ofè Jọdan.

12. Umu-ya ndikom we mere ya otú a dika ọ nyere ha iwu:

13. umu-ya ndikom we bubata ya n'ala Kenean, lìe ya n'ọb͕a nke ọhia Makpila, nke Abraham zutara, ya na ọhia, ka ọ buru ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì, n'aka Efron onye-Het, n'iru Mamre.

Jenesis 50