1. Josef we dakwasi n'iru nna-ya, kwakwasi ya ákwá, sutu kwa ya ọnu.
2. Josef we nye ndi-orù-ya, bú ndi-dibia, iwu ib͕asì ozu nna-ya; ndi-dibia ahu we b͕asì ozu Israel.
3. Ewe debezuere ya ọgu ubọchi abua: n'ihi na otú a ka anēdebezu ubọchi ndi anāb͕asì ozu-ha: ndi Ijipt we kwara ya ákwá ọgu ubọchi atọ na iri.
4. Ubọchi ikwara ya ákwá we gabiga, Josef we gwa ulo Fero okwu, si, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru unu, biko, kwuenu na nti Fero, si.
5. Nnam merem ka m'ṅua iyi, si, Le, mu onwem gaje inwu: n'ílìm nke m'doziworo onwem n'ala Kenean, n'ebe ahu ka i gēlìm. Ma ugbua, biko, ka m'rigo, lìe nnam, lata.