1. Josef we dakwasi n'iru nna-ya, kwakwasi ya ákwá, sutu kwa ya ọnu.
2. Josef we nye ndi-orù-ya, bú ndi-dibia, iwu ib͕asì ozu nna-ya; ndi-dibia ahu we b͕asì ozu Israel.
3. Ewe debezuere ya ọgu ubọchi abua: n'ihi na otú a ka anēdebezu ubọchi ndi anāb͕asì ozu-ha: ndi Ijipt we kwara ya ákwá ọgu ubọchi atọ na iri.
4. Ubọchi ikwara ya ákwá we gabiga, Josef we gwa ulo Fero okwu, si, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru unu, biko, kwuenu na nti Fero, si.
5. Nnam merem ka m'ṅua iyi, si, Le, mu onwem gaje inwu: n'ílìm nke m'doziworo onwem n'ala Kenean, n'ebe ahu ka i gēlìm. Ma ugbua, biko, ka m'rigo, lìe nnam, lata.
6. Fero we si, Rigo, lìe nna-gi, otú o mere gi ka i ṅua iyi.
7. Josef we rigo ilì nna-ya: ndi-orù Fero nile, na ndi-okenye ulo-ya, na ndi-okenye nile nke ala Ijipt,
8. na ulo Josef nile, na umu-nne-ya, na ulo nna-ya, we so ya rigo: nání umu-ntakiri-ha, na ìgwè ewu na aturu-ha, na ìgwè ehi-ha, ka ha rapuru n'ala Goshen.
9. Ma ub͕o-ala ma ndi inyinya nēbu we so ya rigo: ọmuma-ulo-ikwū ahu we di oké uku.
10. Ha biarue ebe-nzọcha-ọka nke Atad, nke di n'ofè Jọdan, ha we were iti-aka-n'obi di uku di kwa ike nke-uku ti aka n'obi n'ebe ahu: ọ we mere nna-ya oruru-újú ubọchi asa.