8. ubọchi nile nke Set we buru nnù arọ abua na ọgu ise na iri na abua: o we nwua.
9. Enosh di ndu ọgu arọ anọ na iri, ọ mua Kenan:
10. Enosh di ndu, mb͕e ọ musiri Kenan, nnù arọ abua na iri na ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:
11. ubọchi nile nke Enosh we buru nnù arọ abua na ọgu ise na ise: o we nwua.
12. Kenan di ndu ọgu arọ atọ na iri, ọ mua Mahalalel:
13. Kenan di ndu, mb͕e ọ musiri Mahalalel, nnù arọ abua na ọgu abua, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:
14. ubọchi nile nke Kenan we buru nnù arọ abua na ọgu ise na iri: o we nwua.
15. Mahalalel di ndu ọgu arọ atọ na ise, ọ mua Jered:
16. Mahalalel di ndu, mb͕e ọ musiri Jered, nnù arọ abua na oru na iri, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:
17. ubọchi nile nke Mahalalel we buru nnù arọ abua na ọgu anọ na iri na ise: o we nwua.
18. Jered di ndu ọgu arọ asatọ na abua, ọ mua Inok: