Jenesis 5:6-14 Bible Nso (IGBOB)

6. Set di ndu ọgu arọ ise na ise, ọ mua Enosh:

7. Set di ndu, mb͕e ọ musiri Enosh, nnù arọ abua na asa, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

8. ubọchi nile nke Set we buru nnù arọ abua na ọgu ise na iri na abua: o we nwua.

9. Enosh di ndu ọgu arọ anọ na iri, ọ mua Kenan:

10. Enosh di ndu, mb͕e ọ musiri Kenan, nnù arọ abua na iri na ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

11. ubọchi nile nke Enosh we buru nnù arọ abua na ọgu ise na ise: o we nwua.

12. Kenan di ndu ọgu arọ atọ na iri, ọ mua Mahalalel:

13. Kenan di ndu, mb͕e ọ musiri Mahalalel, nnù arọ abua na ọgu abua, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

14. ubọchi nile nke Kenan we buru nnù arọ abua na ọgu ise na iri: o we nwua.

Jenesis 5