Jenesis 5:3-10 Bible Nso (IGBOB)

3. Adam we di ndu ọgu arọ isi na iri, ọ mua nwa n'oyiyi-ya, dika onyinyo-ya si di; ọ kpọ aha-ya Set:

4. ubọchi nile nke Adam, mbe ọ musiri Set, bu nnù arọ abua: ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

5. Ubọchi nile nke Adam di ndu we buru nnù arọ abua na ọgu isi na iri: o we nwua.

6. Set di ndu ọgu arọ ise na ise, ọ mua Enosh:

7. Set di ndu, mb͕e ọ musiri Enosh, nnù arọ abua na asa, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

8. ubọchi nile nke Set we buru nnù arọ abua na ọgu ise na iri na abua: o we nwua.

9. Enosh di ndu ọgu arọ anọ na iri, ọ mua Kenan:

10. Enosh di ndu, mb͕e ọ musiri Kenan, nnù arọ abua na iri na ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

Jenesis 5