Jenesis 5:21-32 Bible Nso (IGBOB)

21. Inok di ndu ọgu arọ atọ na ise, ọ mua Metusela:

22. Inok na Chineke we yikọ nējeghari, mb͕e ọ musiri Metusela, ọgu arọ iri-na-ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

23. ubọchi nile nke Inok we buru ọgu arọ iri-na-asatọ na arọ ise:

24. Inok na Chineke we yikọ nējeghari: ọ nọghi kwa: n'ihi na Chineke kuru ya la.

25. Metusela di ndu ọgu arọ iteghete na asa, ọ mua Lemek:

26. Metusela di ndu, mb͕e ọ musiri Lemek, nnù arọ na ọgu iri-na-iteghete na arọ abua, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

27. ubọchi nile nke Metusela we buru nnù arọ abua na ọgu asatọ na iteghete: o we nwua.

28. Lemek di ndu ọgu arọ iteghete na abua, ọ mua nwa-nwoke:

29. ọ kpọ aha-ya Noa, si, Onye a gākasi ayi obi banyere ọlu-ayi, banyekwara ndọb͕u ayi ji aka-ayi adọb͕u onwe-ayi n'ọlu, bú nke putara n'ala Jehova buworo ọnu.

30. Lemek di ndu, mb͕e ọ musiri Noa, nnù arọ na ọgu iteghete na iri na ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

31. ubọchi nile nke Lemek we buru nnù arọ na ọgu iri-na-asatọ na arọ iri na asa: o we nwua.

32. Noa we b͕a nnù arọ na ọgu ise: Noa we mua Shem, na Ham, na Jefet.

Jenesis 5