14. Isaka bu inyinya-ibu di ike,Nāmakpuru n'etiti ogige-aturu abua:
15. Ọ we hu izu-ike, na ọ di nma,Hu kwa ala ahu, na ọ di uto;Ọ we chebe ubu-ya ibu ibu,We ghọ onye nēfè òfùfè orù.
16. Dan gēkpeputa ndi-ya,Dika otù nime ebo nile nke Israel.
17. Ka Dan buru agwọ n'uzọ,Aju-ala n'okporo-uzọ,Nke nāta ikiri-ukwu inyinya aru,Onye o nēbu we daghachi azu.
18. Nzọputa-Gi ka m'cheworo, Jehova
19. Gad, usu ndi nāpunara madu ihe gākpagide ya:Ma ya onwe-ya onwe-ya gākpagide ha n'ikiri-ukwu.
20. Asha ka abuba si aputa, bú nrí-ya,Ya onwe-ya gēnye kwa ihe-utọ di iche iche nke eze.
21. Naftali bu nne-ele arapuworo arapu:Bú onye ahu nke nēnye okwu-ọnu nile di utọ.
22. Nwa osisi nke nāmi nkpuru ka Josef bu,Nwa osisi nke nāmi nkpuru nke di n'akuku isi-iyi;Umu-ya ndinyom nāribiga mb͕idi.
23. Ndi-ọ̀kà-uta mere ya ihe-ilú,B͕a kwa ya àkú, kpọ kwa ya asì:
24. Ma uta-ya nānọgide n'idi-ike,Ab͕a-kwa-ra ogwe-aka-ya abua ume,Site n'aka Dike nke Jekob,(N'ebe ahu ka onye-ọzùzù-aturu si bia, bú nkume Israel,)