Jenesis 49:13-20 Bible Nso (IGBOB)

13. Zebulun, n'ọnu-miri nke oké osimiri ka o gēbi:Ya onwe-ya gānọ kwa n'ọnu-miri nke ub͕o.Akuku-ya gādi kwa n'akuku Zaidon.

14. Isaka bu inyinya-ibu di ike,Nāmakpuru n'etiti ogige-aturu abua:

15. Ọ we hu izu-ike, na ọ di nma,Hu kwa ala ahu, na ọ di uto;Ọ we chebe ubu-ya ibu ibu,We ghọ onye nēfè òfùfè orù.

16. Dan gēkpeputa ndi-ya,Dika otù nime ebo nile nke Israel.

17. Ka Dan buru agwọ n'uzọ,Aju-ala n'okporo-uzọ,Nke nāta ikiri-ukwu inyinya aru,Onye o nēbu we daghachi azu.

18. Nzọputa-Gi ka m'cheworo, Jehova

19. Gad, usu ndi nāpunara madu ihe gākpagide ya:Ma ya onwe-ya onwe-ya gākpagide ha n'ikiri-ukwu.

20. Asha ka abuba si aputa, bú nrí-ya,Ya onwe-ya gēnye kwa ihe-utọ di iche iche nke eze.

Jenesis 49