1. Jekob we kpọ umu-ya ndikom òkù, si: Chikọtanu onwe-unu, ka m'we gosi unu ihe gādakwasi unu na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.
2. Zukọnu, nukwanu, umu-ndikom Jekob;Genu nti n'olu Israel, bú nna-unu.
3. Reuben, ọkparam ka i bu, ikem, na nkpuru mbu nke umem;Ọkaka nke nbuli-elu, na ọkaka nke ike.