Jenesis 47:9-15 Bible Nso (IGBOB)

9. Jekob we si Fero, Ubọchi arọ nke ọnọdu-ọbìam nile di ọgu arọ isi na iri: ha di ole-na-ole, jọ kwa njọ, bú ubọchi arọ ndum, ha erughi kwa ubọchi arọ ndu nke nnam-hà n'ubọchi ọnọdu-ọbia-ha.

10. Jekob we gọzie Fero, si n'iru Fero pua.

11. Josef we me ka nna-ya na umu-nne-ya biri n'ala, ọ nye kwa ha ihe-onwunwe n'ala Ijipt, n'ebe kachasi nma nke ala ahu, n'ala Rameses, dika Fero nyere iwu.

12. Josef were nri zùa nna-ya, na umunne ya, na ulo nile nke nna-ya, dika ọnu-ọgugu nke umu-ntakiri si di.

13. Nri adighi n'ala ahu nile; n'ihi na oké unwu ahu di arọ́ nke-uku, ala Ijipt na ala Kenean we nāda mbà n'ihi oké unwu ahu.

14. Josef we chikọta ego nile anāchọta n'ala Ijipt, na n'ala Kenean, n'ọnọdu ọka ndi ahu nāzu: Josef we chita ego ahu n'ulo Fero.

15. Ego we gwu-chapu n'ala Ijipt, na n'ala Kenean, ndi Ijipt nile we biakute Josef, si, Nye ayi nri, n'ihi gini ka ayi nānwu n'iru gi? n'ihi na ego agwuwo.

Jenesis 47