Jenesis 47:20-30 Bible Nso (IGBOB)

20. Josef we zutara Fero ala Ijipt nile; n'ihi na ndi Ijipt rere ọhia-ha, onye ọ bula ọ re nke ya, n'ihi na oké unwu ahu siri ike n'aru ha: ala ahu we ghọ ihe Fero nwere.

21. Ma ndi ahu, ọ mere ka ha gabiga ba n'obodo nile site n'otu nsọtu ókè-ala Ijipt rue nsọtu-ya ọzọ.

22. Nání ala ndi-nchu-àjà ka ọ nāzu-tagh: n'ihi na ndi-nchu-àjà nwere òkè nri sitere n'ebe Fero nọ, ha ri-kwa-ra òkè-nri-ha nke Fero nyere ha; n'ihi nka ha ereghi ala-ha.

23. Josef we si ndi ahu, Le, azutawom unu na ala-unu nye Fero ta: le, unu gēnwe nkpuru-ọghigha, unu gāgha kwa nkpuru n'ala.

24. O gēru kwa, n'ọmume-ya, na unu gēnye Fero ọtù uzọ n'uzọ ise, uzọ anọ aburu kwa ihe unu nwere, ibu nkpuru-ọghigha nke ubi, na ibu ihe-oriri-unu, na iburu ndi nọ n'ulo-unu ihe-oriri, na iburu umu ntakiri-unu ihe-oriri.

25. Ha si, I debewo ayi ndu: ka ayi huta amara n'iru onye-nwem, ayi gāghọrọ Fero ndi-orù.

26. Josef we me ya ka ọ buru ukpuru bayere ala nke Ijipt rue ta, na Fero gēnwe otù uzọ n'uzọ ise; nání ala ndi-nchu-àjà nwere iche nāghọghi ihe Fero nwere.

27. Israel we biri n'ala Ijipt, n'ala Goshen; ha we nwe ihe-onwunwe nime ya, mu kwa ọmùmù, ba uba nke-uku.

28. Jekob we di ndu n'ala Ijipt arọ iri na asa: ubọchi Jekob, bú arọ ndu-ya, we di ọgu arọ asa na asa.

29. Ubọchi Israel gānwu we rue nso: ọ kpọ nwa-ya Josef, si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, biko, tiye aka-gi n'okpuru apata-ukwum, me-kwa-ram ebere na ezi-okwu; biko, elìlam n'Ijipt:

30. kama mu na nnam-hà gēdina, i gēsi kwa n'Ijipt bupum, lìkwam n'ílì-ha. Ọ si, Mu onwem gēme dika okwu-gi si di.

Jenesis 47