18. Arọ ahu we gwu, ha we bia-kute ya n'arọ nke-abua, si ya, Ayi agaghi-ezonari onye-nwem, na ọ buru na ego agwusia, ọ buru kwa na onye-nwem nwere anu-ulo, bú anumanu-ayi, ọ dighi ihe fọduru n'iru onye-nwem, ma-ọbughi aru-ayi na ala-ayi:
19. n'ìhi gini ka ayi nānwu n'anya-gi, ma ayi, ma ala-ayi? zuru ayi na ala-ayi n'ọnọdu nri, ayi onwe-ayi na ala-ayi gāghọ-kwa-ra Fero ndi-orù: gi nye kwa ayi nkpuru-ọghigha, ka ayi we di ndu, ghara inwu anwu, ka ala we ghara kwa itọb͕ọrọ n'efù.
20. Josef we zutara Fero ala Ijipt nile; n'ihi na ndi Ijipt rere ọhia-ha, onye ọ bula ọ re nke ya, n'ihi na oké unwu ahu siri ike n'aru ha: ala ahu we ghọ ihe Fero nwere.
21. Ma ndi ahu, ọ mere ka ha gabiga ba n'obodo nile site n'otu nsọtu ókè-ala Ijipt rue nsọtu-ya ọzọ.
22. Nání ala ndi-nchu-àjà ka ọ nāzu-tagh: n'ihi na ndi-nchu-àjà nwere òkè nri sitere n'ebe Fero nọ, ha ri-kwa-ra òkè-nri-ha nke Fero nyere ha; n'ihi nka ha ereghi ala-ha.
23. Josef we si ndi ahu, Le, azutawom unu na ala-unu nye Fero ta: le, unu gēnwe nkpuru-ọghigha, unu gāgha kwa nkpuru n'ala.