18. Arọ ahu we gwu, ha we bia-kute ya n'arọ nke-abua, si ya, Ayi agaghi-ezonari onye-nwem, na ọ buru na ego agwusia, ọ buru kwa na onye-nwem nwere anu-ulo, bú anumanu-ayi, ọ dighi ihe fọduru n'iru onye-nwem, ma-ọbughi aru-ayi na ala-ayi:
19. n'ìhi gini ka ayi nānwu n'anya-gi, ma ayi, ma ala-ayi? zuru ayi na ala-ayi n'ọnọdu nri, ayi onwe-ayi na ala-ayi gāghọ-kwa-ra Fero ndi-orù: gi nye kwa ayi nkpuru-ọghigha, ka ayi we di ndu, ghara inwu anwu, ka ala we ghara kwa itọb͕ọrọ n'efù.
20. Josef we zutara Fero ala Ijipt nile; n'ihi na ndi Ijipt rere ọhia-ha, onye ọ bula ọ re nke ya, n'ihi na oké unwu ahu siri ike n'aru ha: ala ahu we ghọ ihe Fero nwere.
21. Ma ndi ahu, ọ mere ka ha gabiga ba n'obodo nile site n'otu nsọtu ókè-ala Ijipt rue nsọtu-ya ọzọ.