Jenesis 47:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. Josef we ba, gosi Fero, si, Nnam na umu-nnem, na ìgwè ewu na aturu-ha, na ìgwè ehi-ha, na ihe nile ha nwere, esiwo n'ala Kenean bia; ma, le, ha nọ n'ala Goshen.

2. O we si n'etiti umu-nne-ya nile chiri ndikom ise, guzo ha n'iru Fero.

3. Fero we si umu-nne-ya, Gini bu ọlu unu nālu? Ha si Fero, Ndi-ọzùzù ìgwè ewu na aturu ka ndi-orù-gi bu, ma ayi onwe-ayi, ma nna-ayi-hà.

Jenesis 47