Jenesis 40:3-14 Bible Nso (IGBOB)

3. Ọ we tiye ha n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ n'ulo onye-isi ndi-ob͕ū, nime ulo-nkpọrọ, bú ebe Josef nọ n'ab͕u.

4. Onye-isi ndi-ob͕ū we me ka Josef nēlekọta ha anya, ọ we jere ha ozi: ha nọ ubọchi ufọdu n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ.

5. Ha we rọ nrọ, ha abua, onye ọ bula ọ rọ nrọ-ya n'otù abali ahu, onye ọ bula dika akukọ-isi nrọ-ya si di, bú obu-ihe-ọṅuṅu na osi-ite eze Ijipt nwere, ndi nọ n'ab͕u n'ulo-nkpọrọ.

6. Josef we bakute ha n'ututu, hu ha, ma, le, iru nāb͕aru ha.

7. Ọ we jua ndi ahu nējere Fero ozi, ndi nọyere ya n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ n'ulo onye-nwe-ya, si, Gini mere iru-unu ji jọ njọ taa?

8. Ha si ya, Nrọ ka ayi rọworo, ọ dighi kwa onye nākọ isi-ya. Josef we si ha, Ọ̀ bughi Chineke nwe akukọ-isi nrọ nile? biko, kọrọnu m.

9. Onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu ahu we kọrọ Josef nrọ-ya, si ya, Na nrọm, le, osisi vine di n'irum.

10. alaka atọ di kwa n'osisi vine ahu: vine ahu we di ka ọ nāma ifuru, okoko-ya nile b͕ọwara; uyọkọ-ya nile miri nkpuru-vine chara acha:

11. iko Fero di kwa n'akam; m'were nkpuru-vine ahu, pinye ha n'iko Fero, nye iko ahu n'aka Fero.

12. Josef we si ya, Nka bu akukọ-isi-ya: alaka atọ ahu, ubọchi atọ ka ha bu;

13. ọ fọduru ubọchi atọ Fero gēweli isi-gi, me ka i lata n'ọnọdu-gi: i gēnye kwa iko Fero n'aka-ya, dika i nēme na mbu mb͕e i buri obu-ihe-ọṅuṅu-ya.

14. Ma otú ọ di chetam n'onwe-gi mb͕e ọ gādiri gi nma, mekwara m ebere, biko, chetakwa m n'iru Fero, me ka m'si n'ulo a pua:

Jenesis 40