Jenesis 4:18-26 Bible Nso (IGBOB)

18. Ewe mua Irad nye Inok: Irad we mua Mehujael: Mehujael we mua Metushael: Metushael we mua Lemek.

19. Lemek we lutara onwe-ya ndinyom abua: aha otù onye nime ha bu Eda, aha nwayi ibe-ya bu Zila.

20. Eda we mua Jebel: onye ahu bu nna ndi bi n'ulo-ikwū, ndi nwe-kwa-ra anu-ulo.

21. Aha nwa-nne-ya nwoke bu Jubal: onye ahu bu nna ndi nile nākpọ ubọ-akwara, nēb͕u kwa ọ̀jà.

22. Zila kwa, nwayi ahu mu-kwa-ra Tubal-ken, onye nākpu ihe-ọlu nile ọ bula nke ọla na nke ígwè: ma nwa-nne-nwayi Tubal-ken bu Neama.

23. Lemek we si ndinyom-ya:Eda na Zila, nurunu olum;Ndinyom Lemek, genu nti n'okwu-ọnum:N'ihi na nwoke ka m'b͕uworo n'ihi ob͕ub͕u-mmam,Ọ bu kwa nwata-nwoke ka m'b͕uworo n'ihi ubiri-utarim:

24. Asi na ọ bu okpukpu asa ka agābọ̀ Ken ọ́bọ̀,Agābọ kwa Lemek ọgu okpukpu atọ na iri na asa.

25. Adam we mara aru nwunye-ya ọzọ; nwunye-ya we mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Set, si, N'ihi na Chineke doworom nkpuru ọzọ n'ọnọdu Ebel; n'ihi na Ken b͕uru ya.

26. Set kwa, ya onwe-ya ka amu-kwa-ra nwa-nwoke nye; ọ kpọ aha-ya Enosh: mb͕e ahu ka amalitere ikpọku aha Jehova.

Jenesis 4